Banyere Anyị

Akwụkwọ nsọ nke ndị Kristen na-agwa anyị okwu site na akụko ihe mere n'oge ochie ya na olu nke amụma. Ọ nagwa anyị ihe mere n'oge gar'aga na nke g'eme n'oge n'adịghị anya. N'amụma ị egwu, anyị nwere ike ịgụ ozi ikpeazụ nke ịdọ aka na ntị tupu mbibi nke ụwa.

Ozi ịdọ aka na ntị nkaa, nke Nmụọ ozi Atọ ahu kọwara nime Mkpughe 14, dị nkega atọ. N'otu-n'otu nime ịdọ aka na ntị ndịa dị oke mkpa ka ụwa niile nụrụ ya.

  • Nmụọ ozi nke mbụ nagwa anyị ka anyị kpọ-isi-ala nye Chineke Onye okike, Onye ahụ nke mere eluigwe, ụwa, na oke osimiri. Anyị aghaghị ịkpọ-isi-ala nye Onye okike ahụ n'ihi na oge awa nke ikpe Ya abịawo. Nmụọ ozi nke mbụ nagwa anyị otu anyị pụrụ iji amara Chineke nkaa ma dị na njikere ịgabiga ikpe ahụ.

  • Nmụọ ozi nke abụọ n'adọ anyị aka na ntị banyere ndapụ nke okpukperechi n'oge ikpeazụ. Agwara anyị k'anyị \"pụta\" site n'usoro okpukperechi nke n'adịghị asọpụrụ Onye Okike bụ Chineke ya na Okwu Ya nke ekpughere.

  • Nmụọ ozi nke atọ n'adọ anyị aka na ntị na ajọ onye ahụ ga-alụ ọlụ site n'usoro okpukperechi iji buso Onye Okike bụ Chineke na ndị Ya agha nke ikpeazụ. Aga enwe \"akara\" ag'enye ndị n'eso ajọ onye ahụ, ma ndị ahụ nọgidere na ikwesị ntụkwasị obi nye Chineke ka aga-akpagbu. Ma Chineke ga-awụkwasị ikpe Ya n'isi ndị ahụ nwere akara nkaa dị egwu. Ndị nke Ya, ndị nwere okwukwe na ige ntị, ka aga-azọpụta site na ịtọgbọrọ n'efu nke ụwa n'anwụ anwụ. Ha na Chineke ga-esoro gaa n'eluigwe ma n'ele anya ka Ọ na ekegharị ụwa n'izu oke mbụ ya.

Denye aha gị maka ịnata akwụkwo akụko anyị

Bụrụ onye mbụ ga-amara mgbe ebipụtara akwụkwọ ọhụrụ!

newsletter-cover