
Ị chọrọ Ọlụ Ebube?
Nchịkọta
Chineke nwere ogologo akụkọ nke inye ndị nke Ya ihe iribama n'otu oge ahụ ha chọsiri ya ike. Akwụkwọ Nsọ na-agwa anyị ọtụtụ akụkọ banyere amụma ha ndị mezuru, mmadụ ndị agwọrọ ọrịa ha, na ihe omume ha di ịtụnanya nke pụrụ imezu nanị site na azịza nke ekpere. Akwụkwọ nta nkaa nyere anyi ọtụtụ ihe kpatara anyị ga-eji kwere na Akwụkwọ Nsọ dịka okwu Chineke nke nadịghị agbanwe, ya na otu ị pụrụ iji bịakute Chineke n'ihi ihe iribama nke gị.
Udiri
Tratkị
Onye nebipụta akwụkwọ
Sharing Hope Publications
Ọ dị nime
22 Asụsụ
Ibe akwụkwọ ha
6
Otu ezi n’ụlọ nke buru ibu nime otu obodo nara ele anya ibi ndụ kacha mma ma kpebie igafe na ala ndị ọzọ biri. Ma otu ọdị, njem ahụ adịghị mfe; ha ga eji ụkwụ gafee otu ọzara. Na-ebe ahụ ka enwere agwọ dị iche-iche, akpị ha, na oke okpom ọkụ. Ọ bụrụ na onye nā-arịa ọrịa ma ọbụ onye na-aghị ike nke ezi n’ụlọ ahụ adapụ n’azụ ụgbọ na-ebu ibu, ndị ohi gēbuso ya agha.
O teghị anya, nri ha gwụrụ, ma onye ndu ha tikuru Chineke maka ihe iribama. N’ụbọchị sonụ, mgbe ndị mmadụ tetara n’ụra, ha hụrụ iberibe ihe ndị dị ka achịcha ekposara nēlu ala nile. Ọ tọrọ ezi ụtọ, dịka wafer na mmanụ aǹụ. O we zue onye ọbula imeju aguu-ya! O were ha ọtụtụ ụbọchị ịgafe ọzara ahụ, ụbọchị nile achịcha n’ada site n’elu igwe. Tonụ Chineke, azọpụtara ha!
Akụkọ nke a pụrụ ịbụ ihe iju anya, kama ọ bụ ihe mere eme. Ọ bụ otu n’ime ihe olụ ebube ndị ekwuru nime Akwụkwọ Nsọ, ndị ịgamata site na aha ha, Tawrat, Zabur, na Injeel. Akwụkwọ Nsọ nwere ọtụtụ narị akụkọ ndị bụ eziokwu, ọtụtụ nime ha dabere na ihe olụ ebube ndị Chineke mere nime ndụ ha. Ọ bụ akwụkwọ dị mkpa nye oge anyị, mgbe ọtụtụ ndị mmadụ nā-achọ olụ ebube nke onwe ha.
Ọlụ Ebube Ọgbara Ọhụụ
N’ime afọ ndịa, anyị ahụwo agha nke dị n’etiti mba na mba, ọgbaghara dị iche-iche, ọdịda nke akụ n’ụba, anām-achọ ọrụ, ọrịa ndị na-efe efe, na ọnwụ. Amaghịm ihe bụ ọnọdụ gị ugbua. Ewere ike ichụpụ gị n’ụlọ gị. Ọ pụrụ-ibụ na inwere onye ahụ gị ị hụrụ n’anya na-adabere na nguzozi nke nọ na-ētiti ọnwụ na ndụ. Ị pụrụ ịnādọgbu onwe gị ịchọ ọrụ.
Ihe ọbụla ị-na agabiga, ọ na-ēmetụ Chineke n’obi Ọ nọ na njikere imere gị olụ ebube taa dịka ọ dịrị n’oge ochie. Mgbe ị na-enwe obi ọjọọ, ị pụrụ inweta agbam ume site n’ịgụ Akwụkwọ Nsọ, bụ akwụkwọ nke olụ ebube .
Okwu Ndị Chineke Kwuru Nye Oge Anyị
Ụfọdụ mmadụ anaghị enwe mmasị ịgụ Akwụkwọ Nsọ n’ihi na ha nụrụ na o nwere otu esiri gbanwe ụfọdụ nime ya. Ma eleghị anya nghọtahie nkea bụ n’ihi ụzọ ibi ndụ nke ọtụtụ mmadụ ndị na-ekwupụta isoro Akwụkwọ Nsọ. Mgbe ụfọdụ anyị na-ahụta ndị Kristen ndị na aǹụ mmanya na-egbu egbu, na egwu chaa-chaa, n’enyi ihe oyiyi na-ēzighị ezi, iri anụ ezi, na imeso ndị mmadụ n’ụzọ na-adịghị nma.
N’eziokwu, Akwụkwọ Nsọ megidere mmejọ ihe ndịa. Mgbe ndị Kristen n’ebi ndụ na-inupụrụ Chineke isi, nkea emeghị ka Okwu Ya dị ebighị ebi ghara ịdị ire. Onye amụma Aisaia dere sị, “Ahịhịa akpọnwụwo, okoko ọhịa ajụnwụwo, ma okwu Chineke gēguzosike” (Aisaia 40:8). I nēche na ndị mmadụ nwere ike dị ukuu pụrụ ịgbanwe Okwu Chineke ma ọ bụ na ha na eji omume ọjọọ ha nēgosịpụta ya n’ụzọ n’ezigh ezi?
Akwụkwọ Nsọ na-ekwu okwu banyere mgbe onye amụma Devid (onye amakwara dịka Dawud) na ndi ya nara ebu igbe ọgbụgbandụ, bụ igbe ọlaedo nke ihe nọ nime ya bụ Iwu Iri ahụ. Iwu Iri ahụ bụ ụkpụrụ obibi ndụ nke Chineke nyere nke edere na ibe nkume abụa ma tinye ya nime igbe ọgbugbandụ ọlaedo ahụ. Mgbe ebu igbe ahụ nāga, otu nwoke nwara imetụ igbe ọgbụgbandụ ahụ aka–ngwangwa ọ dara nwụa!
Ọ bụrụ na Chineke agaghị ekwe ka aka na-ētozughị oke bitu igbe ahụ dị nsọ nke etinyere Okwu Ya, Ole otu Ọ gēsi ekwe ka ndị mmadụ jọrọ njọ were Okwu ya mee ihe efu? Chineke di ukwuu ichekwa okwu Ya.
N’ikwu eziokwu, Akwụkwọ Nsọ bụ akwụkwọ a kwadoro nke ọma na akụkọ ihe mere eme nke mmadụ. N’oge na-adịbeghị anya, ndi ọzụzụ atụrụ atọ nke Bedouin na Palestine—Muhammad edh-Dhib, Jum’a Muhammad, na Khalil Musa—na mberede chọpụtara Akwụkwọ Mpịakọta Osimiri Nwụrụ Anwụ. Nke a bụ nnukwu nchọpụta dị ukwuu nke mgbe ochie nke mere ka anyị jiri Akwụkwọ Nsọ nke oge a tunyere ihe odide nke Akwụkwọ Nsọ n’oge Ochie nke dinu kamgbe puku afọ abụọ gara aga. Njikọta nkea na-enye ọǹụ, na atụ aka na eziokwu bụ n’ apụghị ịgbanwe ihe Chineke mere ka ọpụta ihē. Ọ bụrụ na ịchọrọ ọlụ ebube, nwee ntụkwasị obi na Akwụkwọ Nsọ bụ ebe tozuru oke ịchọta ya! Na-ēbea ịgachọpụta akụkọ ndị dị ịtụnanya banyere ndị amụma dịka Noa (Nuh), Abraham (Ibrahim), Josef (Yusef), Jona (Yunus), Daniel, Devid (Dawud), na Solomon (Suleiman). O nwere ike ịbụ na ị nụtala iberibe ihe ndi edere banyere ha n’ebe ndi ọzọ, kama Akwụkwọ Nsọ kọrọ akụkọ ahụ dum!
Bịa chọta Ọlụ Ebube Gị
Na ọgbaghara nke ndụ ọbụla ịna agabiga, Akwụkwọ Nsọ nwere akụkọ ọlụ ebube nye gị:
Ị-nọ na ọrịa m’ọbụ onye ị hụrụ nanya? Gụọ akụkọ banyere ihe ọlụ ebube nke ọgwụgwọ Neaman onye ọchị agha Siria nwere ọrịa ekpenta.
Ịna agbasi mbọ ike ịnye ezi na ụlọ gị nrị? Gụọ akụkọ banyere nwanyị di ya nwụrụ nke Lebanon na nwa ya nwoke, ndị na-ānwụghi n’oge ụnwụ mere ogologo oge site na nanị otu ite manụ na otu ojuju aka ụtụ ọka ha nwere nke na-āgwụghị ma ọlị.
Ndu gị Ọ nọ n’ihe ize ndụ? Gụọ akụkọ banyere Ebed-Melech, onye Etiopia bụ oru na obi-eze, onye azọpụtara ndụ ya n’oge agha n’ihi okwukwe o nwere na Chineke.
Ị na-ahụta onwe gị dịka onye ajụrụ ajụ? Gụọ akụkọ banyere Hega onye Ijipt, Gụọ hụrụ ọlụ ebube nile nke Chineke mgbe achụpụrụ ya.
Ị na-emikpu nime nsogbu nile nke ndụ? Gụọ akụkọ mgbe Jisọs Kraịst setịpụrụ aka ya ndajụ wee dị n’oke osimiri O wee zọpụta ndị neso ụzọ ya.
Azịza Dị Ebube
Mgbe anyị nọ na agụ Akwụkwọ Nsọ, anyị n’ejuputa na ntụkwasịobi dị ukwuu na aga-aza ekpere anyị. Jisọs Kraịst sịrị, “Ihe ọbụla unu ga arịọ na-ekpere, na-ēkwenye na ya, aga-eme ya nye unu” (Oziọma, Matiu 21:22). Mgbe anyị gụrụ akụkọ nke ndị ọzọ natara ọlụ ebube site nāka Onyenweayị, anākwali obi anyị n’olileanya iweli arịrịọ anyị rue eluigwe.
Ị chọrọ Ọlụ Ebube? Nwee agbam ume site n’ihe ọlụ ebube ndị edere nime Akwụkwọ Nsọ ma rịọ Chineke ka O nye gị nke gị. N’ezie Ọ ga-anụ ekpere gị n’ụbọchị taa!
Ọ bụrụ na ị ga-achọ ịmatakwu banyere ọlụ ebube ndị edere nime Akwụkwọ Nsọ biko kpọtụrụ anyị na ozi dị na azụ akwụkwọ a.
Copyright © 2023 by Sharing Hope Publications. Apụrụ ibipụta ọrụa ma kesa kwa ya na anaghi ego ọbụla na anataghi ikike.Ewetara ihe odide nke Akwụkwọ Nsọ site na Igbo Baịbụl Nsọ, sitere n’aka Bible Society of Nigeria ®. Copyright © BSN 2013.
Denye aha gị maka ịnata akwụkwo akụko anyị
Bụrụ onye mbụ ga-amara mgbe ebipụtara akwụkwọ ọhụrụ!

Chọta Ndị Ga-ege Gị Ntị
Akwụkwọ ndị ebipụtara egosipụtara
© 2023 Sharing Hope Publications