
Otú I ga-esi Chee Echiche Maka Onwe Gị
Nchịkọta
Ndị amụma nke Chineke buru amụma maka ihe ize ndụ nke ikike okpukperechi bụ nke akara nnọchite anya aha ya kọwara bụ "Babilon." Dịka okwu amụma, ikike nkaa g'ele anya ịnwa ịrụgide ma duba anyị na okpukperechi ụgha. Nanị ụzọ anyị ga-eji nwee ike ịchọta nchekwa bu site n'iche uche n'onwe anyị na ịnogidesi-ike n'ịdabere na mkpughe nke Okwu Chineke. Akwụkwọ nta nkaa na-agwa anyị otu anyị ga-eji chee uche ka anyị bụrụ ndị maara ihe, ndị kwere ekwe n'iche ezi uche n'oge ọgbaghara zuru ụwa niile.
Udiri
Tratkị
Onye nebipụta akwụkwọ
Sharing Hope Publications
Ọ dị nime
21 Asụsụ
Ibe akwụkwọ ha
6
Anyị ka rutere n’elu ugwu nke Gunung Datuk mgbe anyị jere ije dị anya. Mụ na enyi ọhụrụm bụ Adzak nọdụrụ ala ka anyị ǹụrịa n’ilegharị anya. N’oge nā-adịghị anya mkparịta ụka anyị tugharịrị gaa n’isi-okwu ha nke okpukperechi.
“A bụm onye nwere onwem n’iche echiche,” ka Adzak kwuru. “Enwere m echichi nke m gbasara ụwa.”
“Aa eē ,” ka m’zaghachịrị. “Anụwom ka ọtụtụ ndị ntorọbịa Malaysia na-egosịpụta onwe ha dịka ndị nwere onwe ha na iche echiche.”
Adzak chịrị ọchị. “Anyị kwesịrị iche echiche nye onwe anyị. Enwere ọtụtụ mgbagwuju anya ma-ọbụghị. Ọ ga-eme gị ara.”
“Ma gịnị banyere mgbe ịlara ụlọ?” Ka m jụrụ. “Na Malayasia ebe a, ọtụtụ ndị ntorọbịa kpọrọ onwe ha ndị nwere onwe ha iche echiche, kama n’ụlọ, a na-atụ anya na ị ga-esonye na ọchụchụ aja nke ndị Alakụba ma ọ bụ ndị Budda. Ọ bụ gịnị ka ị-na-agwa ndị mụrụ gị?”
“Anaghịm agwa ha,” ka Adzak zaghachịrị. “Anọm n’aga n’iru ime ihe bụ ọchịchọ ha. A pụrụm iche echiche na-enweghị mgbochi, kama nke ahụ g’abụ nye onwem.”
Iche Echiche nke onwe onye ọ dị mkpa?
N’ụfọdụ ebe n’ụwa, inwe nkwenye na-ezịghị ezi pụrụ ime ka achụpụ gị n’obodo gị, chụọ gị n’ọrụ, ma ọbụna gbuo gị. Iche echiche n’onwe gị pụrụ ịbụ ihe ize ndụ. Kama ọ bụ ihe dị mkpa?
Ụwa anyị juputara na nchepụta ndi ziri ezi na ndị dị njọ. Otu ụzọ dị mkpa iji malite ịkpa oke n’etiti ihe ziri ezi na nke n’ezịghị ezị bụ iche na ikwu banyere ha. Ọ bụrụ na ịzụrụ ihe dị oke ọnụ ahịa—dịka ọla-edo, saffron, m’ọbụ igwe nzirita ozi ¡phone—ịgaghị akwụ ụgwọ ma were ya laa n’ụlọ gị. Ị ga enyocha ya nke ọma ma were ya tunyere ngwa ahịa ndị n’aso mpi nke ụlọ ọrụ ọzọ ka o doo-gị anya na ị na enweta nke bu ezigbo ya. N’otu ụzọ a ka ekwesịrị iji meso nchepụta echiche.
Ọtụtụ ihe mgbagwuju anya dị nime ụwa, ọ nādị karị njọ mgbe ndị mmadụ na amanye ndị obodo ị-nabata echiche obi ha gbagọrọ agbagọ. Ka m nkọrọ gị banyere otu amụma dị mkpa. N’ime otu akwụkwọ ochie akpọrọ “Mkpughe Nke Jisọs Kraịst,” amụma eburu n’ime ya kwuru maka ndị mmadụ nwara iji aka ike mee ka ndị ọzọ kwenye na nchepụta nke okpukperechi ha gbagọrọ agbagọ. Ọ na asị otua, “Babịlọn adawo, ọ dawo, bụ obodo ukuu ahụ, n’ihi na o mewo ka mba nile ǹụa site na mmanya nke ọnụma nke ịkwa iko ya” (Mkpughe 14:8).
Okwu ihe atụ ndịa adịghị ike nghọta. Babịlọn bụrụ obodo ochie amara nke ọma, ma aha ya pụtara “ọgbaghara.” Obodo nkea “adawo” ọbụghị n’ihi na o nwere ọgbaghara kama n’ihi na ọ chọghị ịhapụ ọgbaghara ya na azụ. Ọ n’eduhie mba nile isoro ya kwaa iko nke ime mmụọ—nke ahụ bụ, ịgọnarị Chineke site na ịgwakọrịta ozizi ụgha ya na ezi ofufe. A na-ahazi echiche ugha ndia nile ma nabata kwa ha. Amụma nkeā eburu banyere “Babịlọn” na atụ aka otu okpukperechi zuru ụwa nile nke ebum n’obi ya nābụghị nanị imezu mmejọ ihe, kama iwere aka ike rụgide ndị jidesiri eziokwu ike ịnabata ya.
Mkpughe nke Jisọs Kraịst buru amụma na nke a ga-emezu n’ụbọchị anyị. ikekwe ị hụla ihe a ka ọ na eme. E nwere ndị mmadụ ji echiche ugha na anochite anya Chineke? Onwere mgbe akọ na uche gi na esogbu gi?
Ee, nke a mere iche echiche nke onwe onye ji dị mkpa.
Otú I ga-esi Chee Echiche Maka Onwe Gị
Ọtụtụ ndị mmadụ na-ēnwe ojuju afọ ịgbaso okpukperechi nke ndị obodo ha. Ha anaghị enwe ntụgharị uche banyere ihe ha kwenyere. Ha na agbaso omenala nke okpukperechi nke na-ābaghị uru m’ọbụ nke na eweta aram ahụ karịa. Mgbe ụfọdụ, ọbụna ndị ndu nke okpukperechị bụ ndị kwesịrị igosị anyị ụzọ nke esi erute Chineke, na-ejuputa na nrụrụ aka nke onwe ha.
Olee ụzọ anyị ga esi achọta eziokwu? A na m eche na anyị aghaghị ịtụkwasị ndị amụma obi. N’ihi gịnị? O nwere ụzọ ihe atọ kpatara nke a:
Ndị amụma n’egosịpụta ihe ọmụma dị ịtụnanya banyere ọdị n’iru. Onye amụma Daniel buru amụma maka mbili nke mba Europe na akụkọ otu mba ahụ g’esi mee ka ụwa nile nọ n’okpuru ya. Jisọs Kraịst (onye amakwara dịka Isa al-Masih) buru amụma banyere mbibi nke Jerusalem na afọ 70 CE. Onye amụma Moses (Musa) buru amụma banyere akụkọ Ishmael rue n’ọgwụgwụ oge.
Ndị amụma kwuru maka ihe ọmụma nke ahụike n’ụzọ dị ịtụnanya. Onye amụma Moses, onye biri ndụ n’ihe dịka puku afọ atọ na narị ise gara aga, kọwara maka idote ndị nrịrịa iche, ikpofu ureure, iji kwalite ọnọdụ ahụ-ịke na kwa ụkpụrụ nke ime ka ihe oriri dị ọcha. O kewara anụmanụ n’ụzọ abụọ ndị dị ọcha na ndị na-ādịgh ọcha. Ọ gwa kwara anyị ka anyị hapụ iri ọbara m’ọbụ abụba mgbe anyị n’eri anụ ndị dị ọcha. Ọbụna n’ụbọchị taa, ndị na-āgbaso usoro nke ihe oriri ahaziri nke ọma na iwu nke ịdị ọcha n’ebi ndụ afọ iri na ise karịa ndị na-ādịghị eme otu ahụ.
Chineke na anụ ekpere ndị kwere ekwe ndị tụkwasirị Ya obi na ndị gere ndị amụma Ya ntị.
Ihe odide nile nke ndị amụma bụ nke juputara n’ihe nduzi-ma anyị inweta uru site na ha, anyị aghaghị ịmụta iche echiche dị omimi, ịnwale ihe ndị anyị kwenyere, na kwa ime nchọpụta n’ebe okwukwe anyị dabere. Ị-na eche echiche bụ otu akụkụ dị mkpa nke okpukperechi.
Ugbua, ọbụ gịnị n’eme mgbe anyị mere nnyocha banyere mmejọ ihe? Ọ pụrụ ịdị ka ọbụ eziokwu na nmalite. Ma dịka anyị na achọ ihe akaebe, anyị na-amalite ịhụta msogbu na echiche ahụ.
Eziokwu bụ nanị nke nēmegide okwu ugha ndịa. Ọ dịghị ihe ọbụla nke ọ nētufu mgbe akpachapurụ anya tulee ya. Dịka anyị nāga n’iru ime nnyocha, anyị n’aga kwa n’iru ịchọpụta eziokwu.
Ndị kwere ekwe aghaghị ịbụ ndị kachasị nwee amam-ị he n’ime ụwa nile n’ihi na Chineke nēduzi anyị n’ụzọ nke ihe ọmụma. Ọ bụrụ na ịhụta ọnwe gị n’ọnodụ nke egbochiri gị iche echiche nke onwe gị, m’ọbụ jụọ ajụjụ, nke ahụ esiteghi na Chineke. Ọ na-akpọ anyị oku ịbịakute Ya ịjụ ajụjụ n’ihi na eziokwu dị ike nke ukuu iguzogide nnyocha. Ma Babịlọn na-ādọkpụrụ gị baā n’ụgha ma mechigide gị ụzọ n’ebe ahụ ka ịghara ịgba mbọ inweta ihe ọmụma.
Ọ bụrụ na ị -na enwe mgbagwoju anya nke bụ n’ọdị gị ka ịnọ nime Babịlọn, si n’ime ya pụta! Bịa n’okporo ụzọ nke amamihe nke Chineke. Chee echiche maka onwe gị ma jụọ ajụjụ ndị gbagwojuru gị anya. Agaghị agharịpụ gị.
Ị ga-āchọ ịmata karịa banyere Mkpughe Nke Jisọs Kraịst? Biko kpọtụrụ anyị site na ozi dị na azụ akwụkwọ a.
Ewetara ihe odide nke Akwụkwọ Nsọ site na Igbo Baịbụl Nsọ, sitere n’aka Bible Society of Nigeria ®. Copyright © BSN 2013.
Denye aha gị maka ịnata akwụkwo akụko anyị
Bụrụ onye mbụ ga-amara mgbe ebipụtara akwụkwọ ọhụrụ!

Chọta Ndị Ga-ege Gị Ntị
Akwụkwọ ndị ebipụtara egosipụtara
© 2023 Sharing Hope Publications