
Izu Ike Nime Ụwa Nke Izu Ike Na-adịghị
Nchịkọta
Nchekasị ahụ na ịrụbiga ọrụ oke na eduba ọtụtụ mmadụ n'ili tupu oge ha eruo. Ma na okike, Chineke rọpụtara ọgwụgwọ nye nsogbu nke nchekasị ahụ: ụbọchị izuike. Ụbọchi nsọ nkaa ka emere ka ọ bụrụ ngọzi ka ọ ga- abụ na ụmụ mmadụ pụrụ izu ike site n'ọrụ ha iji wepụta ohere nye Chineke. Ọ bụ ihe nwute, ọbụna na agbanyeghị na Chineke nyere ndị mmadụ iwu ka ha n'echeta ya, ọtụtụ mmadụ echefuwo banyere ụbọchi a pụrụ ịche, ma ọbụna ọtụtụ ndị echezowo Onye Okike onye nyere ha ya.
Udiri
Tratkị
Onye nebipụta akwụkwọ
Sharing Hope Publications
Ọ dị nime
21 Asụsụ
Ibe akwụkwọ ha
6
Mita Duran nwụrụ. Nwata nwanyi onye Indonesia na-edepụta ihe n’ike juputara na ndụ gbara afọ iri-abụọ na anọ, dakwasiri nnọọ tụbọọ n’oche ya. Ọ bụ gịnị mererinụ?
Mita bụ onye n’arụ ọrụ n’ebe ana agbasa ozi ịtụ mgbere ahịa, ebe anatụ anya ihe dị elu na aka ya ma ọrụ ahụ bụ nke karịrị ya. Tupu ọnwụ ya o kwupụtara banyere ike ọgwụgwụ ya nke omere n’ịgbasa ozi n’ụlọ nzirita ozi ọha n’eze: “Na abalị a, ejim mkpịsị igodo nke ụlọ ọrụ nime ụbọchị asatọ. . . . Ndụ afọdụghị kwa nimem.”
Ọ tụkwasịrị obi ya nke ukuu n’ihe ọǹụǹụ caffeined Krating Daeng bụ udi ihe ọǹụǹụ Red Bull nke ndị Esia. Okwu ikpeazụ o kwuru na intanetị siri, “iri awa atọ anọm n’ọrụ ma dịkwa ike.” Ọ dara n’oche ya ma o biliteghị ọzọ.
Kedu ihemerenu? Mita nwụrụ nihi oke oru.
N’ụbọchị taa, ọtụtụ n’ime anyị adịghị ezu ike site n’oke ọrụ. Ụwa anyị nọ n’ime ya na agba anyi ume ka anyị na arụ-ọrụ karịa, nweta kwa ego karịa, ma zụta kwa ihe karịa. Anyị na- ahuju anya site na nchekasị ahụ, ụra agaghị n’anya na itinye echiche n’oke ọrụ.
Anyị nwere ike anyi anaghị egbu onwe anyị dịka Mita Duran, ma ndụ pụrụ ịbụ ibu dị arụ. Nke a ọ bụ ihe Chineke zubere nye anyị? Ọ bụ Ya bụ Onye n’enye Udo. Mgbe anyị dọgbusịrị onwe anyị n’ọlụ, anyị n’enwe udo? Ọbụghị n’ezịe!
Ọ bụrụ na anyị enwebiga ike ọgwụgwụ oke, ọ pụrụ ịbụ na anyị n’echefu ihe Chineke na achọ ka anyị cheta. Ka anyị chọpụta ihe O kwuru banyere ezum-ike.
Na-aku botịnu “Nkwụsịtu”
Chineke bụ Onye kachasi nwee Amara na Ebere. Ọ matara na mmadụ kwesịrị inwe oge nke itutegharị ikike nke elu-arụ, nke ụbụrụ na nke ime-mmụọ ya, dịka ekwentị na nke igwe kọmputa. Ya mere onye amụma Moses (amara dịka Musa) dere iwu Chineke:
Cheta Ụbọchị izuike ido ya nsọ. Ụbọchị isii ka ịga alụ ọlụ gị jee ozi gị nile, ma ụbọchị nke asaa bụ ụbọchị izu ike nke Jehova bụ Chineke gị nwere. Ịgaghị eje ozi ọbụla nime ya (Site na nkega nke Akwụkwọ Nsọ [Baịbụl], nke amakwara dịka Tawrat: Ọpụpụ 20:8-10).
Iwu Chineke nkea nke na-adịghị agbanwe agbanwe na agwa anyị ka anyị cheta ụbọchị nke asaa. Nye ọtụtụ asụsụ nime ụwa, ụbọchị asaa nke edoro nsọ nye izu ike ka akpọrọ “Sabat.” Gịnị mere Chineke jiri nye anyị iwu icheta ya? Ọ bụ n’ihi na Ọ matara na mmadụ ichefu ihe bụ otu nsogbu mmadụ nwere, site na Adam. Anyi ekwesighị ichefu iwu ndị Chineke nyere anyị, n’ihi n’ọbụ nanị mgbe anyị chetara Ya na iwu Ya nile ka anyị ga-anọgịde n’ije ije n’okporo ụzọ dị larị.
Ọbụ gịnị mere Sabat ji bụrụ ihe pụrụ iche? Chineke na-agwa anyị,
N’ihị na ụbọchị isii ka Chineke mere eluigwe na ụwa, na oke-osimiri, na ihe nile dị nime ya, ma zuru ike n’ụbọchị nke asaa. N’ihi nkā ka Chineke gọziri Ụbọchị izuike do kwa ya nsọ (Ọpụpụ 20:11).
Ụbọchị izuike bụ ihe dị mkpa nēchetara anyị na Chineke bụ Onye Okike. Ụfọdụ mmadụ anabataghị nkea ebe o bụ na ike adịghị agwụ Chineke, ọ gaghị adị kwa Ya mkpa izuru-ike n’ụbọchị nke asaa. Mana Chineke ezughị ike n’ihi ike ọgwụgwụ; Ọ kwụsịtụrụ n’ọlụ nke okike Ya iji nye anyị oge dị nsọ izuru ike.
Chineke hụrụ na ụbọchị izuike bụ ihe dị mma nye mmadụ. O mere ụbọchị nke asaa ị bụ Sabat, nke pụtara ịkpa oke m’ọbụ ịkwụsịtụ site n’ọlụ. Ya mere, ụbọchị nke asaa n’ime izu ọbụla bụ ụbọchị pụrụ iche ịpị-aka na botịnu “nkwụsịtụ”. Anyị gēzu ike site n’ọrụ na ije ozi ndị nādịghị nsọ nime otu ụbọchị zuru oke iji cheta ma kpọ kwa isi-ala nye Ya.
Ọ gaghị abụ ihe dị ịtụnanya m’ọbụrụ na onye-isi ọrụ m’ọbụ onye ọka-nmụta n’ụlọ akwụkwọ enye gị iwu ka izuru ike ọtụtụ mgbe? Ma nkea bụ n’ezie ihe Chineke nyere anyị iwu ime! Otuto diri Chineke! N’ezie Ọ bụ onye obi ebere!
Ina-edo Ụbọchị Chineke Nsọ
Ụbọchị izuike bụ ụbọchị edoro nsọ nime ụwa nile nye mmadụ. Ọ bụ ndi kwere n’otu ezi onye okike bụ Chineke, debere ya ogologo afọ tutu ndị Juu, ndị Kristen, Ndị Alakụba, ndị Budda, m’ọbụ ndị Hindu amalite. N’eziokwu, enyere ya mmadụ nile mgbe ekere ụwa. Adam na Iv (nke ama-kwara dịka Hawwa) debere Ụbọchị Izuike, Ma ọ dịghị mgbe ọbụla Chineke kwadoro anyị ichefu ihe O nyere anyi iwu icheta.
Ọ bụ ihe nwute, na Ụbọchị izuike ka anēchefu ọtụtụ mgbe. Ndị amụma dọrọ ndị Juu n’oge ochie aka na ntị na Chineke geweta mbibi n’isi ha ma ọbụrụ na ha echefue Ụbọchị Izuike. Ha egeghị ntị na ịdọ aka na ntị ahụ, ya mere ebibiri Jerusalem, ma adọrọ ezi n’ụlọ ha nile laa na agha. Ndị Kristen chefukwara Ụbọchị Izuike site na ịgbanwe ụbọchị ahụ dị nsọ ma n’efe ofufe n’ụbọchị Sọnde bụ nke nēmegide iwu Chineke. Ndị Alakụba n’akpọ isi-ala n’ụbọchị Fraịdee ma ha echefuwo na anyị aghaghị izu ike n’ụbọchị nke asaa iji bie ndụ zuru oke nke ige onye Okike ntị.
N’ihi gịnị ka o jiri dị ka ụwa anyị nile nēchefu ụbọchị nkeā dị mkpa? O nwere ihe jọgburu onwe ya karịrị nchefu a juru ebe nile?
Jisọs bụ Mesaịa (onye akpọkwara Isa al-Masih) dọrọ anyị aka na ntị n’ihi ike dị ukuu nke Setan (shaytan) ga eji tụgharịa echiche anyị pụọ n’ebe Onye kere anyị nọ. Ọtụtụ nde mmadụ ka aga eduhie ịkpọ isi-ala na Ụbọchị izuike ụgha. Ọ bụrụ na Setan pụrụ iduba anyị ichefu ụbọchị nke onye Okike, o nwekwara olile anya na anyi ga-echefu onye Okike n’onwe Ya. Ma otu ọ dị, ọ bụrụ na anyị edebe ezi Ụbọchị izuike nsọ, anyị n’egosịpụta nrube isi nye Onye kere anyị ma nweta ọǹụ nke onyinye izu ike, inwe obi ruru ala na udo.
Ịba N’Izuike Nke Chineke
Onye Amụma Moses dere na “Chineke gọziri ụbọchị nke asaa” (Jenesis 2:3). Ike ọ gwụrụ gị, ịdara mba? Ụbọchị izuike nwere ọtụtụ ngọzi!
Mita Duran, onye odee sitere obodo Indonesia, nwụrụ site na ịrụbiga ọrụ oke–ma ikwesịghị ime otua. Chineke na akpọ gị oku ka izuru ike site n’ọrụ gị kwa izu nile ma nweta nmetụta nke ngọzị nile nke Ụbọchị izuike.
Ọ bụrụ na ịgēnwe nmasị ịmụta ihe karịa banyere ụzọ Chineke si enye izuike, udo, na ọgwụgwọ, biko kpọtụrụ anyị site na ozi dị na azụ akwụkwọ nke a.
Copyright © 2023 by Sharing Hope Publications. Apụrụ ibipụta ọrụa ma kesa kwa ya na anaghi ego ọbụla na anataghi ikike.Ewetara ihe odide nke Akwụkwọ Nsọ site na Igbo Baịbụl Nsọ, sitere n’aka Bible Society of Nigeria ®. Copyright © BSN 2013.
Denye aha gị maka ịnata akwụkwo akụko anyị
Bụrụ onye mbụ ga-amara mgbe ebipụtara akwụkwọ ọhụrụ!

Chọta Ndị Ga-ege Gị Ntị
Akwụkwọ ndị ebipụtara egosipụtara
© 2023 Sharing Hope Publications