
Ịna-Achọ Ebere
Nchịkọta
Ọ bụ gịnị ka ebere Chineke yiri? Ọ bụ nanị na O kwuru sị, "Agbagharam gị" ka Ọ rọpụtara ihe nnọchị anya iji sachaa ndekọ akụkọ ihere anyi? Akwụkwọ nta nkaa na-ekerita akụkọ umu amala iji nyere aka kọwa ọ dị mkpa na ihe ọ pụtara bụ ọchụchụaja nnọchịte anya. Ndị na-agụ ya ga-achọta olileanya n'ịmara na apụrụ ịgbaghara mmehie ha ya na iwepụ kwa ihere ha.
Udiri
Tratkị
Onye nebipụta akwụkwọ
Sharing Hope Publications
Ọ dị nime
21 Asụsụ
Ibe akwụkwọ ha
6
Fatima nọrọ nanị ya n’oge Eid-al-adha ma ịnọ nanị ya ahụ bụrụ nke karịrị ya ịnagide. Ịnọ nanị ya ahụ bụ nke o ji aka ya kpatara onwe ya, ọ bụghị ya?
Fatima chetara otú ya na nna ya siworo nwe ndọndọ di ọkụ banyere ịlụ Ahmed. Ọ bụ nwagbọghọ ma bụrụ onye nọ nime ihụnanya. Kedu ka nna ya jiri si mba? Mgbe ọ gbapụrụ site n’ụlọ ịlụ Ahmed, nna ya gwara ya ka ọ ghara ịlọghachị n’ụlọ ọzọ.
O chere na ọ pụrụ ịnagide ihere nkea n’ihi ịhụnanya o nwere nye Ahmed. Ma n’oge n’adịghị anya o kwenyere n’ihe nna ya kwuru ziri ezi. Ahmed abụghị nwoke ahụ o chere na ọ hụrụ n’anya. Ọ hapụrụ ya gakwuru nwanyị ọzọ.
Fatima nwere ihere banyere onwe ya. O kwe-nyere na ya ezutewo ikpe ziri ezi ma na akwụghachị ụgwọ akaụntụ ya. Ọ ghọtara nke ọma ihe ikpe ziri ezi pụtara. Mana, obi ya chọsiri ebere ike!
Onye Ahụ Kachasị nwee Obi Ebere na Amara
Ọ bụrụ na anyi ekwuo eziokwu anyi nile emejọwọ ọtụtụ ihe ma jụ ịnabata ndụmọdụ nke olu amamihe. Anyị emejọwo ndị ọzọ. Ndị ọzọ emejọwo-kwa anyị. Obodo anyị juputara na mmadụ ndị n’emehie ihe. Ma ọ bụ ihe siri ike ịgbaghara ndị ọzọ na anyị onwe anyị kwa!
Aga emere anyị ebere maka ihe ndị ha anyị mejọrọ?
Chee echiche banyere ọtụtụ oge ịn’ekwu “bismillah Al-Rahman Al-Raheem”—“na aha Chineke nke Onye kachasi nwee obi ebere na amara.” Gịnị bu ihe pụrụ iche banyere ebere?
ikekwe ọ bụ n’ihi na obodo anyị ha- na obi nke aka anyi-chọsiri ebere ike.
Ebere: Okporo Ụzọ ka Mma
Na afọ ole n’ole gara aga, otu nwoke aha ya bụ Abdul-Rahman lụsịrị onye agbata obi ya bụ Kareem ọgụ ma gbuo ya. Ndụ kwụsịrị nye ezi n’ụlọ abụọ ndịa n’obodo nta nọ n’Ijipt. Ezi n’ụlọ Kareem chọrọ ịbọ-ọbọ, ma n’oke egwu ezi n’ụlọ Abdul-Rahman chọrọ ikpuchite ya. Abdul-Rahman achọghi ka ihe omume nke ịbọ-ọbọ ahụ gaa n’iru. Ọ riọrọ ndị ndu obodo ka ha nye ya ndụmọdụ, ha tụrụ ero ka eme ememe nkpuchi ọnwụ.
Abdul-Rahman wetara akwa olili ozu dị ọcha nke ọtụkwasịrị mma n’elu ya. Ọ zọpụrụ njem izute ezi n’ụlọ Kareem n’ime ahịa, ndị obodo nọ nēkiri nkeā. Abdul Rahman gbunyere ikpere n’ala n’íru Habib, bụ nwanne nwoke onye ahụ o gburu, o nyefere ya akwa olili ọcha na mma ahụ. Ọ rịọrọ maka ebere na mkpezi.
Habib jiri mma ahụ tụkwasị n’olu Abdul-Rahman. Ndi ndu nke obodo wetara atụrụ, Habib aghaghị ime nkpebi ya: imere ya ebere ma ọ bụ ịbọ-ọbọ? Dịka ọ tụkwasirị mma ahụ n’olu Abdul-Rahman, omume ya gosịpụtara, “Ndụ na onwụ gị dị na akam ugbua. Anya nile na-ekiri ihe omume a; onye ọ bụla mara na m nwere oke ruru m igbu gị ya na enwekwaram ikike ime ya. Kama m na-ahọrọ imere gị ebere na kwa anyi ime mkpezi. Agam eme ka nkwafu ọbara kwụsị.”
Ọ tụgharịrị azụ ya n’ebe Abdul-Rahman nọ ma gbuo atụrụ ahụ n’ọnọdụ ya. Mgbe emesịrị ka anụmanụ ahụ natasịa oke ihe ngbu, ahụhụ na iwe, na ikpe ziri ezi n’ọnọdụ Abdul-Rahman, Habib tụgharịrị makụọ Abdul-Rahman. Eweghachịrị udo n’etiti ezi n’ụlọ abụọ ndịa.
Ọ bụrụ na mmadụ pụrụ ichọpụta ụzọ isi ejikọta ikpe ziri ezi na ebere, n’ezie Chineke pụrụ ime otu ihe ahụ!
Jisọs Mesaia Ahụ: Ebere sitere na Chineke
Olee ebe anyị pụrụ isi mụta ihe banyere ebere nke Chineke? Ọ bụ ihe dị mfe. Ịnụwo ma elegh anya na Jisọs bụ Mesaia ahụ (onye amara dịka Isa al-Masih) bụ onye anākpọ “Ebere” ahụ sitere na Chineke. Nke a pụtara na Ya onwe ya bụ ebere zuru oke. Ụzọ Ya—ihe ndị Ọ kụziri n’ime Oziọma nile, bụ ndị amakwara dịka Injeel—nkea bụ ụzọ nke mgbaghara na ime ka adị n’otu.
Jisọs nke bụ Mesaia ahụ pụrụ ịluzu udi ọlụ a dị ebube n’ihi n’ọbụ nanị Ya ka Chineke zitere, onye zuru oke na-enweghị nmehie. Onye amụma ọbụla na onye ozi ọbụla dị nsọ chọrọ mgbaghara nmehie maka ihe ndị ha mejọrọ, ma ọbụghị Mesaia ahụ bụ Jisọs. Eweliri Ya laa n’eluigwe kama ị nọ chere ụbọchị ikpe n’ihi na o nweghị mgbe ọbụla O mejọrọ ihe—ọbụna nke dịkasịrị nta.
N’ihi nke a ka akpọrọworo Ya Ebere sitere na Chineke. O nyere anyị ihe nlere anya nke ebere dị ọcha ma kuzie ụzọ esi anata ebere nke Chineke.
Olee otú Jisos Onye bụ Mesaia ahụ pụrụ iji nyere m aka?
Ihe ndekọ mere ka amara na Jọn Baptist (bụ onye amakwara dịka Yahya) hụrụ Mesaịa ahụ bụ Jisọs n’etiti igwe mmadụ ma, n’okpuru nduzi nke Chineke, tiri nkpu sị, “Le Nwatụrụ Chineke onye nēbupụ nmehie nke ụwa!” (Oziọma, Jọn 1:29). Jisọs bụ Mesaia ahụ dika atụrụ ahụ nke mere ụzọ udo maka Abdul-Rahman.
Ọ bụrụ na anyị anata ntaram ahụhụ n’ihi ihe ndị anyị mejọrọ, nkea bụ ikpe ziri ezi. Kama Jisọs bụ Mesaịa, onye na-enweghị ntụpọ nke nmehie, rara onwe Ya nye iburu ibu nke nmejọ ihe anyị nile. O nweghi onye ọbụla rụgidere ya. O kpebiri n’onwe ya ịnwụ ọnwụ iji kwụghachị ụgwọ nke ikpe ziri ezi. Ọ bụ nanị Ya bụ onye biri ndụ na-enweghị ntụpọ, ma o kwere ka a na-emeso Ya dịka atụrụ ahụ nime akụkọ akọrọ maka Abdul-Rahman. Ọ bụ nkea mere na, mgbe ọ natasịrị ntaram ahụhụ n’ihi anyị, Chineke weliri Ya laa n’eluigwe.
Ọ pụrụ ịbụ na inwere ọgbaghara nime ndụ gị. Ma eleghị anya ị dị ka Fatima, onye ndị nke ahu i hụru n’anya chụpụrụ. Ma eleghị anya o nwere onye mejọrọ gị, ma ọbụ ekwutọwo gị n’ụzọ nā-adịghị mma. Ma eleghị anya ị dị ka Abdul-Rahman, onye ikpe mara ma nwekwa egwu mmegwara.
Jisọs bụ Mesaịa ahụ nwere ike inye aka. Nanị ihe ị pụrụ ime bụ ikpe ntakịrị ekpere nkea:
Onyenwe-ayị, apụghịm ịkwụ ụgwọ nmehiem. Kama amataram na I zitere Jisọs bụ Mesaịa dịka Ebere Gị nye ayị. Biko gbaghara m n’ihi ihe ọma ndị o mere nye mmadụ nile. Nyerem aka ịghọta ụzọ nke Jisọs bụ Mesaịa ahụ, ka m nwee ike inweta nmetụta nke obi ebere Gị nime ndụm. Amen.
Ọ bụrụ na ị ga-āchọ inweta akwụkwọ Oziọma ndịa nke gị, biko kpọtụrụ anyị site na ozi dị na azụ akwụkwọ a.
Copyright © 2023 by Sharing Hope Publications. Apụrụ ibipụta ọrụa ma kesa kwa ya na anaghi ego ọbụla na anataghi ikike.Ewetara ihe odide nke Akwụkwọ Nsọ site na Igbo Baịbụl Nsọ, sitere n’aka Bible Society of Nigeria ®. Copyright © BSN 2013.
Denye aha gị maka ịnata akwụkwo akụko anyị
Bụrụ onye mbụ ga-amara mgbe ebipụtara akwụkwọ ọhụrụ!

Chọta Ndị Ga-ege Gị Ntị
Akwụkwọ ndị ebipụtara egosipụtara
© 2023 Sharing Hope Publications