Nchekwa Pụọ N’aka Mmụọ Ọjọọ

Nchekwa Pụọ N’aka Mmụọ Ọjọọ

Nchịkọta

Ndi mmụọ nwere ikike, ma ha-adịghị ike dịka Jisọs bụ Mesaia ahụ. Akwụkwọ nta nkaa kọwara otu Jisọs jiri chupu ndị mmụọ ọjọọ site nime ndị mmadụ na-ahụju anya ma nyere ha aka ịchọta ọgwụgwọ. Ọ pụrụ ime otu ihe ahụ nye anyị n'ụbochị taa. Akwụkwọ Ya na akụziri anyi ihe niile anyị kwesịrị ịma iji nwere onwe anyị pụo na aka iyi egwu na nsogbu ndị mmụọ ọjọọ. Ọ Kuzi-kwara anyị otu anyị pụrụ iji gbanarị ịbụ ndị eduhiere site na-aka ndị na-anọchị anya ndị mmụọ ọjọọ tupu nlọghachị Ya.

Budata-ala

Jinn juru n’ebe nile. M’ọbụ na ịkpọrọ ha ndị mmụọ, ndị nwụrụ anwụ na eje ije, ndị mmụọ ọjọọ na-emekpa ndị mmadụ ahụ, m’ọbụ Jinn, ha pụrụ ịbụ ihe n’atụ egwu. Shamans, ndị dibịa ngba-nsi, na ọgwụ dị iche-iche ka amara nke ọma, ma n’ezie ha pụrụ ikpuchite anyị?

Ọ ga amasịm ime ka unu mata nzọ ụkwụ atọ dị mfe esi enweta nkpuchite pụọ n’aka ndị mmụọ ọjọọ nke ga-eme ka ịhapụ ịtụ egwu. 

Nkpuchite pụọ n’aka ndị Mmụọ Ọjọọ

Nwoke ahụ gba ọtọ na eti oke mkpu. O nwere ọtụtụ mmụọ ọjọọ na-esogbu ya, ma o nweghị onye pụrụ inyere ya aka. Ndị mmadụ nọ n’ime obodo gbalịrị iji ụdọ igwe kegide ya, kama ọ na-etijisi ha site n’ike o nwere bụ ike karịrị nke mmadụ o wee gbafuo jee biri n’ebe ana eli ndị nwụrụ anwụ. Ọ na anọ n’ụbọchị nile nke ndụ ya na akwa akwā n’ihe mgbu ma weere nkume na emerụ onwe ya ahụ.

Ma rue mgbe otu nwoke akpọrọ Jisọs Kraịst bịaruru n’ebe ahụ, onye amakwara dịka Isa al-Masih.

Nwoke a bụ onye emekpara ahụ na mgbe o kpughere ọnụ ya ịrịọ maka enyem aka, mmụọ ọjọọ ahụ  na-etikwasị Jisọs mkpu n’oke olu ka ọ hapụ nanị ya. Ma Jisọs apụghị. Ọ matara ihe na-ara eme. Nātụghị egwu, o nyere mmụọ ọjọọ ahụ (Jinn) iwu ka ọ hapụ nwoke ahụ.

“Achụbala anyị nime abyss!” ka mmụọ ọjọọ ahụ rịọrọ. Ha rịọrọ ka ha banye nime igwē ezi nọ nso. Jisọs nyere ha iwu ka ha hapụ nwoke ahụ ma banye nime anụ ndị ahụ  na-adịghị ọcha. Na-ētufughị oge, emere ka ahụ nwoke ahụ dị ike, ma igwē ezi ahụ nile mikpuru na ntakiri osimiri nọ na-ēbe ahụ.

N’ikpeazụ, nwoke ahụ nwere onwe ya. O nwere obi ekele! Kama nkea abụghị nanị akụkọ ahụ. Jisọs Kraịst nwere ikike karịrị nke ndị mmụọ ọjọọ. N’ebe ọbụla o jere, ọ napụtara mmadụ ndị mmụọ ọjọọ na-ēsogbu. O nyekwara ndị na-ēsọ ụzọ Ya ikike na-ēbe ndị mmụọ ọjọọ nọ:

Ma lee, E nyewom unu ikike . . . nēbe ike nile nke onye iro ahụ nọ. Ma ọ nweghị ihe ọbụla ga emekpa unu ahụ. Ma na nka unu aǹụrịla ọǹụ, na ndị mmụọ ọjọọ bụ ndị ewedara n’okpuru unu, kama ǹụrịanụ ọǹụ n’ihi na edewo aha unu n’eluigwe (Oziọma, nke amakwara dịka Injeel, Luk 10:19, 20).

Mgbe anyị soro Jisọs Kraịst, anyị ga-enwe nkpuchi nime ndụ a na nkwa ndụ nke gaje ịbia! Ka anyị leba anya na nzọ-ụkwụ atọ esi enwere onwe-onye pụọ na-aka ndị mmụọ ọjọọ.

Nzọụkwụ nke mbụ: Nabata Ike nke Aha Jisọs Kraịst

Nzọụkwụ nke mbụ bụ ịchọ mkpuchi n’aha Jisọs Kraịst. Anyị enweghị ike nke onwe anyị. Kama mgbe anyị kwuputara aha nke Jisọs Kraịst n’ebe ndụ anyị nọ, ndị mmụọ ọjọọ agaghị enwe ike na-ebe anyị nọ! Jisọs kwuru banyere ndị na-eso ya: “Na aham ha ga achụpụ ndị mmụọ ọjọọ” (Oziọma, Mak 16:17).

Ọ bụrụ na iji obi gị nile kwere na Jisọs Kraịst ga-eme ka inwere onwe gị, ọ ga-eme ya! Nanị rịọ Chineke arịrịọ a. “Onyenwe m, biko napụtam pụọ na-aka ndị mmụọ ọjọọ site na aha Onye Ahụ nke i zitere, bụ Jisọs Kraịst!” 

Nzọụkwụ nke abuọ: Chọ maka nsacha nke Elu Ahụ na Ime Mmụọ

Jisọs Kraịst kụziri ka anyị ghara inye ekwensu ohere. O kwuru sị, “Onye isi nke ụwa nkeā na-abịa, o nweghị ihe onwere ike ime nēbe M nọ” (Oziọma, Jọn 14:30). Anyị aghaghị ime ka ndụ ayị dị ọcha p ọ n’ike nile nke nmehie. 

Gịnị ka ọ putara na o nweghị ihe ekwensu “nwere na-ebe anyị nọ”? Nkea pụtara na o nweghị ihe ọbụla nke dị nime obi anyị m’ọbụ n’ebe obibi anyị bụ nke ya. Anyị aghaghị itufu nkwenye ụgha na ọgwu dị iche iche. Anyị aghaghị iwezuga onwe anyị pụọ n’udi mmehie dị iche iche dịka ikiri ihe onyonyo na-akpali mmụọ ịkwa iko, ọgwụ ike dị iche iche na ihe ọǹụǹụ na-egbu egbu. Ọ bụrụ na onwere mgbe anyị tinyere aka na ọchụchụ aja nke ịjụ ndị nwụrụ anwụ ase m’ọbụ in’ekwupụta ọbụbụ ọnụ, anyị aghaghị iwezuga onwe anyị pụọ na omume ndịa na-ētufughị oge. Ya mere, anyị na-eme ka ebe nlere anya nke ogbe anyị dị ọcha pụọ na nhuku nke ndị mmụọ ọjọọ. Mgbe ahụ, anyị aghaghị ikpere Chineke ka ọ gbaghara anyị ma sacha anyị nsacha nke ime ahụ.

Nzọ-ụkwụ nke atọ: Mejuputa Ndụ Gị na Ihē

Mgbe Jisọs Kraịst napụtasịrị gị pụọ n’ike nke ndị mmụọ ọjọọ, rịọ ya ka o tụtee ndụ gị. Ahapụla obi gị ka ọtọgbọrọ na-efu. Jisọs Kraịst kwuru sị,

Ma mgbe ọbụla mmụọ nādịghị ọcha siri n’arụ mmadụ pụọ, ọ nāgabiga nēbe miri nādịghị, nāchọ izuike, ma ọ dịghị achọta ya. Mgbe ahụ ọ sị m’ga alaghachị n’ụlọm ebe m siri pụta, mgbe ọ bịara o wee hụ ya ka ọtọgbọrọ nēfu azachasịa ya, dozisịa ya. Mgbe ahụ ọ gāchịrị mmụọ ibe ya asaa nke jọkarịrị onwe ya njọ tinyere onwe ya ha wee ba biri nēbe ahụ. Ọnọdụ ikpeazụ nke mmadụ ahụ bịa jọkarị nke mbụ (Oziọma, Matiu 12:43-45).

Mgbe emesịrị ka ịdị ọcha pụọ na-aka mmụọ ọjọọ, mejupụta ndụ gị nime ihē nke akwụkwọ Jisọs, bụ Akwụkwọ Nsọ. Jisọs bịara n’ime “ụwa dịka ihē, ka onye ọbula nke kwere na (ya) ghara ị-nọ n’ọchịchịrị” (Oziọma, Jọn 12:46). Nweta otu akwụkwọ nke Jisọs ma gụọ ya ụbọchị nile ka ihē Ya napụta gị n’ọchịchịrị.

Nkpuchi Maka Ọdịn’iru

Anyị n’ebi ndụ n’ọgwụgwụ oge mgbe ndị mmụọ ọjọọ na-alusi ọlụ ike karịa na mbụ. Jisọs Kraịst kwuputara na tutu nlọghachị ya, na ikike nke ndị mmụọ ọjọọ ga eme ihe iribama ụgha dị iche iche iduhie ndị kwere ekwe. Nye ụfọdụ, mmụọ ọjọọ gapụta ihē n’udi dị egwu dịka mmụọ ndị nwụrụ anwụ; nye ndị ọzọ ha ga egosị onwe ha dịka ndị mmụọ ozi m’ọbụ ndị nke ha nwụrụ anwụ. Ọbụna ekwensu n’onwe ya ga eme onwe ya ka o yie Jisọs Kraịst!

Kama ekwela ka ewere okwu ụgha ndịa duhie gị. Ọ bụrụ na isoro Jisọs Kraịst, ọ ga-enye gị ike iguzogide ekwensu. Ezigbo enyim, nye ihe ọbụla na-akpagbu gị taa, kwe ka Jisọs Kraịst mee ka inwere onwe gị!

Ọ bụrụ na ịchọrọ ka onye n’eso Jisọs Kraịst kpere gị ekpere ka anapụta gị pụọ na-aka ndị mmụọ ọjọọ, biko kpọtụrụ anyi na ozi nọ na azụ akwụkwọ a.

Copyright © 2023 by Sharing Hope Publications. Apụrụ ibipụta ọrụa ma kesa kwa ya na anaghi ego ọbụla na anataghi ikike.
Ewetara ihe odide nke Akwụkwọ Nsọ site na Igbo Baịbụl Nsọ, sitere n’aka Bible Society of Nigeria ®. Copyright © BSN 2013.

Denye aha gị maka ịnata akwụkwo akụko anyị

Bụrụ onye mbụ ga-amara mgbe ebipụtara akwụkwọ ọhụrụ!

newsletter-cover