
Enweghị Egwu N’ikpe Ahụ
Nchịkọta
Ịna-eche echiche banyere ụbọchị ahụ ikpe ga-etinye egwu n'obi ọtụtụ mmadụ. Olee otu anyị ga-esi jide n'aka na anyị ga-agafe ụbọchị ikpe ikpeazụ nke nguzi? Chineke sịrị na Ya ga-enye anyị Onye Nkwuchite Ọnụ - Onye ga-ekwuchite ọnụ anyị n'ikpe n'ụzọ ahụ onye ọka iwu si ekpechite ọnụ anyị n'ụlọ ikpe nke ụwa. Akwụkwọ nta nkaa na akọwaputara anyi Onye Nkwuchite Ọnụ nkaa ma kuziere anyị otu anyị ga-eji nwee nmasiobi ike dịka anyị n'eche maka ikpe ahụ na-abịa.
Udiri
Tratkị
Onye nebipụta akwụkwọ
Sharing Hope Publications
Ọ dị nime
21 Asụsụ
Ibe akwụkwọ ha
6
Otu ụtụtụ ahapụrụm ime ụlọm n’ụlọ ndị ọbịa ịga ọgbakọ dị mkpa. Agaram n’azụ oge nkea mere na agbaram oke ntụfụrụ—nke megidere iwu okporo ụzọ. Mgbe ọ fọdurụ ọkara irute ebe m na-aga, otu onye isi ndị uwe ojii jiderem ma gwam na m ga-ēje n’ụlọ ọrụ ndị uwe ojii! Oke egwu tụrụm ma olile anya adịghị n’ihi na amataram na abụ m onye ikpe mara.
Mgbe onye isi ndị uwe ojii ahụ meghere akwụkwọ ebe edepụtara iwu ndị aga eji kpem ikpe, akpọrọm jee n’ụlọ ikpe nọ nso maka ikpem ikpe. Ezuterem otu enyi m onye n’aru ọrụ dịka onye ọka-iwu n’ebe ahụ. Ọ juru ya anya ihụ m. Mgbe m mere ka ọ mara ọnọdụm, ọ sịrịm, “Echegbula onwe gi. Agam abụ onye ọka iwu gị” Obi dịrị m ụtọ nke ukwuu. Enyi m ga-abụ onye ga ekwuchite ọnụm!
N’ihi na enyi m batara dịka onye nkpechite ọnụm, onye ọkaikpe ahụ dara m obere nha. Ahapụrụm ụlọ ikpe ahụ n’eto Chineke.
N’ezie ọ bụ ihe na-atụ oke egwu iguzo n’iru ọkaikpe nke ụwa. Kama nkeā abụghị ihe eji atụnyere ihe o yiri iguzo n’iru Chineke n’oke Ụbọchị ikpe nke inye nguzi. Ọ bụrụ na ọ ga abụ echi, ị ga adị na njikere?
Ime Njikere Maka Ikpe
Ụfọdụ mmadụ na eji agwa ọ gbasaghịm azaghachị ikpe nke na-abịa. Ha na aǹụ mmanya n’aba n’anya, n’ese anwụrụ-ọkụ, na agba chaa-chaa, na aga n’ụlọ ite-egwu na oriri na ọǹụǹụ nke abalị, na ekiri kwa ihe onyonyo ndị na-adịghị mma. Ha nwere ike mara na a na-edekọ ihe ndịa na akwụkwọ ndekọta, kama ha bụ ndị mara n’ ọnya nduhie nke Setan (onye amakwara dịka Shaytan). Ha achọghị ị ma.
Ndị mmadụ ọzọ na azaghachị site n’oke egwu. Ha agaghị anwa anwa ahapu ikpe otu ekpere. Ha na eche echiche nke ukwuu maka ntaram ahụhụ nke ili m’ọbụ nke ọkụ ala mmụọ wee chefue ịhụnanya na obi ọma nke Chineke.
Ma dịka m nwere onye nkpechite ọnụ n’ụlọ ikpe, Chineke arọpụtawo onye nkwuchite ọnụ onye ga-ēnyere anyị aka inwe mmeri n’ikpe ahụ. I kwesịghị ịnọ n’enweghị onye nkwuchite ọnụ!
Onye Bụ Onye Nkwuchite Ọnụ Anyị?
Echiche nke inwe onye nkwuchite ọnụ abụghị ihe ọhụụ. Na afọ ọbụla, ọtụtụ puku mmadụ ndị n’eme njem ala nsọ na-eleta ụlọ arụsị ndị nọ n’Ugwu nke Afrịka, Etiti Ọwụwa Anyanwụ, na Esia. Ọtụtụ ndị mmadụ n’ekpe ekpere n’ili ndị ndu amara aha ha nwụrụ-anwụ, na ’ekwenye na ha ga ekwuchite ọnụ ha.
Ọ bụ ihe ziri ezi ịkwanyere ndị ndu nwụrụ anwụ bụ ndị amara aha ha ugwu, kama ị-na ekpere ha ekpere m’ọbụ ịchọ ka ha kwuchite ọnụ anyị bụ ihe arụ. Ha nwụrụ anwụ ha apụghị imere gị ihe ọbụla. Ọbụna ndị amụma nọ n’ime ili, nēchere Ụbọchị Mbilite n’ọnwụ.
Ọ bụ ezie n’ọbụ ihe arụ ịrịọ ndị nwụrụ anwụ ikwuchite ọnụ anyị, echiche nke ikwuchitere ndị ọzọ ọnụ bụ ihe kwesịrị ekwesị. Ma ọ bụ ekpere onye ka Chineke na anabata? Ọ ghaghị ịbụ onye
Dị ndụ (n’ihi na onye nwụrụ anwụ apụghị ikwuchite ọnụ anyị).
Enweghị mmehie (n’ihi na onye nọ n’ikpe ọmụma nke iwu apụghị ịbụ onye nkwuchite ọnụ nye ndị ọzọ).
Ọ bụ onye tozuru oke inweta ọnọdụ ndịa? Ọ dịghị onye tozuru oke ma ọbụghị Jisọs Kraịst ahụrụ nanya, onye amakwara dịka Isa al-Masih, bụ onye dị ndụ n’eluigwe na-enweghị ntụpọ ọbụla.
Chebara ya uche–O nwere onye ọbụla ọzọ pụrụ ikwupụta na ya enweghị mmehie ọbụla? Adam riri mkpụrụ osisi ahụ egbochiri ya iri; Noa (Nuh) ǹụrụ mmanya na-ēgbu egbu; Abraham (Ibrahim) ghara ụgha; Moses (Musa) gburu mmadụ; Devid (Dawud) zuru nwunye nwoke ọzọ n’ori. Ị gaghị ahụta otu onye amụma nke na-ēmejọghị ihe m’ọbụ rịọ arịrịọ maka mgbaghara.
Ma Jisọs Kraịst enweghị mgbe ọbụla O mehiere. Ya onwe Ya kwupụtara sị, “Onye ziterem Nọnyerem. . . . Anam eme ihe ndị ahụ nātọ Ya ụtọ” (site na akwụkwọ oziọma, amakwara dịka Injeel, Jọn 8:29).
Izute Ikpe Ahụ N’udo
Jisọs Kraịst dị ndụ n’elu-ịgwe na-enweghị mmehie ọbụla. Ọ nọ na njịkere ikwuchite ọnụ mụ na gị. Oga alọghachi n’oge n’adighi anya.
Ọ bụrụ na Ọ ga-ālọghachị nke ugbo abụọ, nkea pụtara na Jisọs Kraịst bụ onye amụma ikpeazụ. Eē, karịa onye amụma—ọ bụ onye Nkwuchite ọnụ anyị, Onyenwe-ayị, na Udo n’Ụbọchị Ngụkọ. Ọ gwara anyị sị, “N’ezie. . . ọ bụrụ na onye ọbụla edebe okwu M ọ gaghị anwụ ma ọlị” (Oziọma, Jọn 8:51).
Jisọs anwụghị anwụ; ọ dị ndụ! Ọ na ewu otu obodo n’elu ụwa ọbụna ugbua. N’oge ụfọdụ Ọ na-ākpọ ndị mmadụ oku ka ha bata n’ime obodo ya site na ịbiakute ha na nrọ dịka otu nwoke yi akwa ọcha m’ọbụ site n’igosị anyị ihe iribama mgbe anyị na arịọ Chineke arịrịọ na-ēkpere na aha ya.
Ị ga achọ inwe udo n’Ụbọchị Ngukọ? Kwuputa okwukwe gị n’ime Jisọs Kraịst. Gịnị mere anyị ga eji tụkwasị ndị nwụrụ anwụ obi ma bụrụ ndị na-amaghị ihe ga-abụ ọnodụ ha n’Ụbọchị ngụkọ? Jisọs mara nke ọma ihe bụ ọnọdụ Ya n’elu-igwe. Dịka enyim bụ onye ọka-iwu n’ime ụlọ ikpe, Ọ ga-ēnyere anyị aka.
Ma eleghị anya ị-na enwe obi abụọ ma ihe dị ịtụnanya ọ pụrụ ịbụ eziokwu. Jisọs Kraịst sịrị, “Ọ burụ na unu arịọ ihe ọbụla na aham, Agam eme ya nye unu” (Oziọma, Jọn 14:14). Mee otu nnwale iji chọpụta ma ihe m’nāgwa gị bụ eziokwu. Ọ bụrụ na Jisọs nwere ike dị ukwuu izute ọnọdụ ndị dị oke mkpa na ndụ ugbua, ya mere n’ezie Ọ pụrụ ịbụ onye kwesịrị ntụkwasị obi ịbụ onye nkwuchite ọnụ anyị. Rịọ Chineke arịrịọ n’ezi obi n’aha Jisọs ma hụ ihe g’eme. Ị pụrụ ikpe ekpere a:
Onyenwe-ayị, Ọ ga amasịm ịmata m’ọbụ Jisọs bụ n’ezie onye ahụ nke Ịzitere ịbụ onye nkwuchite ọnụ anyi n’ikpe ahụ. Ọ bụrụ eziokwu, biko nụrụ ekpere m (tinye arịrịọ gị n’ebea). Ana m arịọ nke a na aha Jisọs Kraịst. Amen.
Ọ bụrụ na ị ga-āchọ ịga n’iru ịmụta banyere ụzọ esi eso Jisọs Kraịst, kpọtụrụ anyị site n’ozi dị na azụ akwụkwọ a.
Copyright © 2023 by Sharing Hope Publications. Apụrụ ibipụta ọrụa ma kesa kwa ya na anaghi ego ọbụla na anataghi ikike.Ewetara ihe odide nke Akwụkwọ Nsọ site na Igbo Baịbụl Nsọ, sitere n’aka Bible Society of Nigeria ®. Copyright © BSN 2013.
Denye aha gị maka ịnata akwụkwo akụko anyị
Bụrụ onye mbụ ga-amara mgbe ebipụtara akwụkwọ ọhụrụ!

Chọta Ndị Ga-ege Gị Ntị
Akwụkwọ ndị ebipụtara egosipụtara
© 2023 Sharing Hope Publications