
Akwụakwọ ikpọ Oku Mbata Na Ọpụpụ
Nchịkọta
Ịna-ele anya obodo ka mma? Ebe nchekwa, ọṅụ na ezumike dị? Anyị na ele anya ihe ụwa nkaa na-apụghị inye n'ihi na onye ọbụla nime anyị bụ ndị ekere ibi na Paradaịs. Jisọs bụ Mesaia ahụ nọrịị n'ebe ahụ. Ọ mara ụzọ ahụ, ma n'ézie, Ọ kpọrọ Onwe Ya "ụzọ ahụ!" Akwụkwọ nta nkaa na akọwa eziokwu ha dị mkpa banyere Jisọs bụ nke na-enyere anyị aka ime njikere ịbụ ndị nketa nke Paradaịs.
Udiri
Tratkị
Onye nebipụta akwụkwọ
Sharing Hope Publications
Ọ dị nime
21 Asụsụ
Ibe akwụkwọ ha
6
Abdul-Malek bụrụ agadi nwoke ike gwụrụ. Mgbe nwunye na ụmụ ya nwụsiri, ọ gbapụrụ site na Iraq maka ịgbanarị ndị ISIS. Ugbua ọ bụ nanị ya bi dịka onye gbatara ọsọ ndụ na Jọdan.
Ma enwere nchekwube maka olileanya. O nwere nwanne onye bi na Canada nke kwere ya nkwa inyere ya aka inweta ọrụ. O nwere obi ụtọ, ma denye aha ya maka inweta akwụkwọ ikike eji eme njem ọ malitere irọ nrọ maka ibi ndụ dị mfe. N’ikpeazụ, mgbe ọtụtụ afọ gasịrị ọ nọ na-ēchere, anabatara ya n’obodo Canada. Abdul-Malek juputaraworo n›obi n’aǹụrị!
Ma obi ụtọ ya nọrọ nanị nwantakịrị oge. Mgbe ọ bịarutere obodo Canada, ọ chọpụtara na ibi ndụ n’obodo ndị ọzọ adịgh mfe. Ọrụ ọ na-arụ mere ka ọ na-akwụ ọtọ n’ukwu ya ụbọchị nile. Ndị agbata obi ya na-ēme oke mkpọtụ. Ime njem n’ụgbọ ala ọha n’eze adịghị mfe nghọta—asụsụ Bekee adịghị kwa mfe nghọta!
Abdul-Malek nāra arọ nrọ oge nile maka ibi ndụ n’ebe ka mma, kama mgbe ahụ o rutere, ọ chọpụtara onwe ya ịnọ n’aga n’iru inwe obi ntiwa. Ọ malitere inwe obi abụọ ma ọ pụrụ ịchọta ọnọdụ ọ nātụ anya ya n’ebe ọbụla n’elu ụwa m’ọbụ n’ọ ga anọ chere Paradaịs!
Ịba na Paradaịs
O nwere mgbe ịhụtara onwe-gị n’ọnọdụ Abdul-Malek? Inwe ọchịchọ maka obodo ka mma ka etinyere nime obi mmadụ ma mmezu nke a pụrụ ịbụ site na ịbā na Paradaịs, ēzi ebe obibi anyi. Ma nkea bụ ọchịchọ aga-emezu n’oge na-adịghị anya! Ihe Ngosị nke Awa na-apụta ihē na anya anyị, ma ụwa nkea na-ēme ngwa ịgwụ.
Na ọtụtụ narị afọ gara aga, akwụkwọ ndị kwuru maka okpukperechi ndị Juu, ndị Kristen na ndị Alakuba kwuputara maka amụma ndị ga-emezu n’oge ikpeazụ—mgbe anyi ga-esite n’ụwa nkea baa n’ụwa nke ọzọ. Okwukwe atọ ndịa n’atụ aka Mesaịa ahụ–onye ga-eme ka mmezu ihe omume ikpeazụ ndịa dị ire.
Ọ bụ ihe na-enye obi ụtọ na, Mesaia nkea –onye arụtụrụ aka na okpukpechị ndị Kristen na Islam abụghị onye ọzọ m’ọbụghị Jisọs Kraịst, onye amakwara dịka Isa al-Masih. Ọ bụrụ Mesaịa mgbe O biri nime Palestine, kama ọ nọrị n’ebi na Paradaịs nime puku afọ abụọ gara aga. N’ikpeazụ Ọ ga alọghachị n’Ụbọchị Ikpe.
Nlọghachịte Jisọs Kraịst bụ ka ekwuru nke oma n’ụzọ dara ụda nime Akwụkwọ Nsọ, ma ndị Alakụba kwenyere kwa na ọ ga alọghachị kwa ọzọ, ebe ọ bụ na edeworo ya nime Qur’an: “Na (Jisọs) ga-abu ihe Iriba ama (maka obibia nke) nke AWA (nke Ikpe): ya mere enwela obi abụọ banyere (Awa ahụ) kama sorom: nke a bụ Okporo ụzọ ahụ kwu ọtọ” (Az-Zukhruf 43:61).
Dịka onye isi ụlọ ọrụ na-ahụ maka ime njem na-enye nduzi dị mkpa n’ụzọ esi enweta akwụkwọ ikike, Jisọs Kraịst na-ākpọ anyị oku ka anyị leba anya N’ihe Ngosị Ya ka anyị wee mara Okporo ụzọ na-ēduba na Paradais.
Ọ bụ gịnị ka Jisọs kwuru na Paradaịs Yiri?
Oziọma, ndị amakwara ka Injeel ahụ, dekọrọ na Jisọs Kraịst kwuru sị, “Anam aga idoziri unu ebe. Ọ bụrụ na Mụ aga idoziri unu ebe, Agajem ịbịa ọzọ ma nara unu nye Onwem, ka unu onwe unu wee nọ kwa na-ebe ahụ” (Oziọma, Jọn 14:2, 3). Jisọs Kraịst nēkwu na ya pụrụ iduba anyị nime Paradaịs!
O kpughekwara ụfọdụ ihe ndị mara mma maka ebe ahụ. O kwuru na
Ọnwụ agaghị adị kwa ọzọ, ịru-uju, ịkwa akwā, m’ọbụ ihe mgbu (Nkpughe 21:4).
Anyị nile ga eketa ụlọ ndị mara mma (Jọn 14:2).
Ma ndị nwoke na ndị nwanyị ga-enwe otu oke ruru-mmadụ (Ndị Galetia 3:28).
O juputara na ihē, ezi omume, na ọǹụ (Mkpughe 21:21-25).
N’eziokwu, nkea bụ ebe mkpụrụ obi anyị na-āchọsi ike!
Ihe mere Jisọs Kraịst ji abịa nke Ugbo Abụọ
Ma Chineke ezitewo ọtụtụ ndị amụma na ndị ozi dị nsọ. Ọ bụ n’ihi gịnị ka o ji bụrụ Jisọs Kraịst ka ahọrọ ịlọghachị nke ugbo abụọ? Azịza ajụjụ nkea dị mfe site na nkọwa nke ụlọ ọrụ na ahụ maka ime njem. N’ihi na inweta akwụkwọ ikike eji eme njem abụghị ihe dị mfe, ọtụtụ mmadụ na akwụ onye ọka-iwu ụlọ ọrụa ụgwọ, bụ ndị mara ụzọ. Ọ bụrụ na anyị nwere onye nduzi, anyị pụrụ ịtụkwasị ya obi inyere anyị aka.
N’otu aka ahụ, Jisọs Kraịst bụ nanị onye ahụ nke pụtara ihē nke ugbo abụọ n’ihi na Ọ mara ụzọ ahụ na-ēduba na Paradaịs ma Ọ pụkwara iduba anyị na-ebe ahụ. Ya onwe Ya kọrọ na, “Mụ onwem bụ ụzọ eziokwu, na ndụ ahụ” (Jọn 14:6).
Onye amụma ọbụla na onye ozi nke Chineke zitere emejọwo ọtụtụ ihe ma chọkwa mgbaghara. Ma ọ bụghị Jisọs Kraịst. Ọ bụrū onye na-enweghị mmehie n’ime iri afọ atọ na atọ o biri ndụ n’elu ụwa. Nkea mere na eweliri ya elu ngwangwa gaa na Paradaịs.
Anyị aghaghị ịmụta ihe site n’aka Jisọs, bụ nanị onye na-enweghị mmehie, ịmata ụzọ esi emezu ihe ndị achọrọ na-āka anyị maka ịba na Paradaịs. Ọ bụ nanị site n’ụzọ dị otua ka anyị pụrụ ịbụ ndị tozuru oke. Ọ bụ ihe inye ekele, anyị pụrụ ịmụta ihe site na akwụkwọ a, bụ Akwụkwọ Nsọ.
Ime njikere maka Nlọghachị nke Jisọs Kraịst
Ọ bụghị ihe na-enye obi ụtọ na ịmatawo ụzọ iga esi abā n’obodo ka mma? Ana akpọ gị oku ka ịbụrụ otu n’ime ụmụ ala-eze ebube nke Chineke nime Paradaịs! Ọ gaghị adị anya Jisọs Kraịst ga-abịa ịkpọba anyị nile n’ime obodo ọma ahụ.
Ọ bụ ihe pụrụ ime na ị-na eso mmadụ ndị ha onwe ha na-āmaghị ihe ga-ādabara ha n’Ụbọchị Ikpe ahụ? Ọ bụrụ na i-soro Jisọs Kraịst, ị gaghị enwe obi abụọ. Rịọ Chineke arịrịọ ka O duba gị na Ogologo Okporo ụzọ izute Jisọs Kraịst. Ị pụrụ ikpe ekpere yiri nkea:
Onyenwem, obim na-āchọsi obodo ka mma ike. Biko napụta m na ndị m hụrụ na-anya pụọ n’ihe isi ike nke ụwa nkea. Ekwenyerem na oge dị nkpụnkpụ. Biko duziem ka m nwee ike ịba n’obodo ahụ dị ebube nke idoziri nyem. Amen.
Ọ bụrụ na ị ga-achọ inweta otu nime akwụkwọ nke Oziọma ndịa, biko kpọtụrụ anyi na ozi dị na azụ akwụkwọ a.
Nsụgharị n’efu site na Quran bekee gaa n’asụsụ Igbo.Copyright © 2023 by Sharing Hope Publications. Apụrụ ibipụta ọrụa ma kesa kwa ya na anaghi ego ọbụla na anataghi ikike.Ewetara ihe odide nke Akwụkwọ Nsọ site na Igbo Baịbụl Nsọ, sitere n’aka Bible Society of Nigeria ®. Copyright © BSN 2013.
Denye aha gị maka ịnata akwụkwo akụko anyị
Bụrụ onye mbụ ga-amara mgbe ebipụtara akwụkwọ ọhụrụ!

Chọta Ndị Ga-ege Gị Ntị
Akwụkwọ ndị ebipụtara egosipụtara
© 2023 Sharing Hope Publications